Psalms 94

Chineke, onye ikpe nke mmadụ niile

1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ,
o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.
2Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa;
kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.
3 Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe?
Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?

4Ha na-ekwuwapụ okwu mpako;
ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.
5Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị;
ha na-emegbu ihe nketa gị.
6Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa;
ha na-egbu ndị na-enweghị nna.
7Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a;
Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”

8Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m;
unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?
9Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe?
Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?
10Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ?
Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?
11 Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ;
ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.

12Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị,
onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;
13ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu;
tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.
14Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya;
ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.
15Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile;
ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.

16Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume?
Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?
17A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka,
agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.
18Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,”
ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.
19Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m,
nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.

20A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ,
nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?
21Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume
na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.
22Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m,
na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.
23Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha,
lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha;
Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.
Copyright information for IboBIU